Deuteronomy 6

Ịhụ Onyenwe anyị nʼanya

1Ndị a bụ iwu, na ụkpụrụ, na ikpe niile nke Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nyere m nʼiwu ka a kuziere unu ka unu debe, nʼala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta. 2Ihe e ji nye iwu ndị a bụ ka unu na ụmụ unu, na ụmụ ụmụ unu, tụọ egwu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, site nʼidebe iwu ya, ogologo ndụ unu niile. Ọ bụrụ na unu emee ya, unu ga-enwe ndụ ogologo. 3Nụrụ Izrel ma lezie anya nʼirube isi, ka ihe gaara unu nke ọma, ka unu baa ụba nke ukwuu nʼala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru nʼime ya, ọ bụladị dịka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha kwere unu na nkwa.

4Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu. 5Were obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na uche gị na ike gị niile, hụ Onyenwe anyị Chineke gị nʼanya. 6Iwu ndị a m na-enye gị taa ka ị ga-eme ka ọ dịrị gị nʼobi. 7Ị ga-akụziri ya ụmụ gị. Kwuo okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ ala nʼụlọ gị, mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie. 8Keenụ ha dịka ihe ịrịbama nʼelu aka unu, kekwasịkwa ha dịka ihe ncheta nʼegedege ihu unu. 9Dee ha nʼelu ibo ọnụ ụzọ ụlọ gị na nke ọnụ ụzọ ama gị.

10Mgbe Onyenwe anyị Chineke ga-akpọbata unu nʼala ahụ ọ ṅụrụ iyi nye nna nna unu ha, bụ Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, na inye unu, ala sara mbara nke jupụtara nʼobodo unu na-ewughị, 11na ụlọ ihe ọma dị iche iche jupụtara nʼime ya nke unu na-azụghị, na olulu mmiri unu na-egwughị nʼonwe unu, na ubi vaịnị na ọtụtụ osisi oliv unu na-amaghị ndị kụrụ ha, mgbe unu riri ihe rijuo afọ, 12leruonu anya, ka unu ghara ichefu Onyenwe anyị, onye mere ka unu site nʼala Ijipt pụta, bụ ala ebe unu bụ ohu.

13 Onyenwe anyị bụ Chineke gị, ka ị ga-atụ egwu, naanị ya ka ị ga-efe ofufe, ọ bụkwa aha ya ka ị ga-eji ṅụọ iyi. 14Unu agbasola chi ndị ọzọ, bụ chi ndị niile a gbara unu gburugburu na-efe. 15Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu, onye nọ nʼetiti unu, bụ Chineke ekworo. Ọ ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide unu, ọ ga-ekpochapụkwa unu site nʼelu ụwa. 16Anwala Onyenwe anyị, bụ Chineke gị ọnwụnwa, dịka unu nwara ya na Masa. 17Lezienụ anya hụ na unu debere iwu niile na ụkpụrụ niile, na ihe ama niile Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu. 18Meenụ ihe ziri ezi, na nke dị mma nʼanya Onyenwe anyị, ka ihe niile gaara unu nke ọma, ka unu nweekwa ike ịbanye, ma nweta ezi ala ahụ Onyenwe anyị ji ịṅụ iyi kwee nna nna unu ha na nkwa. 19Ka unu chụpụkwa ndị iro unu niile site nʼala ahụ, dịka Onyenwe anyị nʼonwe ya kwuru.

Ọsịsa nye ụmụ ụmụ

20Nʼoge na-abịa, mgbe nwa nwoke gị ga-ajụ gị sị, “Gịnị bụ isi ihe ama ndị a, na ụkpụrụ ndị a, na iwu ndị a Onyenwe anyị Chineke anyị nyere unu?” 21Ị ga-aza ya sị, “Anyị bụrị ndị ohu Fero nʼala Ijipt, ma site nʼike ya dị ukwuu, Onyenwe anyị kpọpụtara anyị site nʼala Ijipt. 22Nʼihu anyị, Onyenwe anyị zipụrụ ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche na ihe ebube dị iche iche, dị ukwuu jọọkwa njọ nʼahụ Ijipt na eze Fero nakwa ndị ụlọ ya niile. 23Ma o mere ka anyị site nʼIjipt pụta, ịkpọbata na inye anyị ala ahụ o ji ịṅụ iyi kwee nna nna anyị ha na nkwa. 24Nʼihi ya ka Onyenwe anyị ji nye anyị iwu ka anyị debe ụkpụrụ ndị a niile, na-atụ Onyenwe anyị Chineke anyị egwu, ka anyị bụrụ ndị ihe ga-agara nke ọma ụbọchị niile, ndị a na-edebe ndụ, dịka ọ dị taa. 25Ọ bụrụ na anyị elezie anya debe iwu ndị a niile Onyenwe anyị Chineke anyị nyere anyị, dịka o nyere anyị nʼiwu, anyị ga-abụ ndị na-ejegharị nʼezi omume.”

Copyright information for IboBIU